I. JỌN 4:9-10
I. JỌN 4:9-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
Kesaa
Gụọ I. JỌN 4I. JỌN 4:9-10 Bible Nso (IGBOB)
Nime nka ka emere ka ihu-n'anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n'uwa, ka ayi we di ndu site n'aka-Ya. Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.
Kesaa
Gụọ I. JỌN 4