I. JỌN 3:11-15
I. JỌN 3:11-15 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi. Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì. Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n'ọnwu ba na ndu, n'ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n'anya. Onye nādighi-ahu n'anya nānọgide n'ọnwu. Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya.
I. JỌN 3:11-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya. Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi. Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị. Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ. Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.