I. JỌN 2:3-6
I. JỌN 2:3-6 Bible Nso (IGBOB)
nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu. Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n'iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu: ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya: onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.
I. JỌN 2:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile. Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya. Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.