I. JỌN 1:5-9
I. JỌN 1:5-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile. Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
I. JỌN 1:5-9 Bible Nso (IGBOB)
Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya. Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu: ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile. Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi. Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.