I. JỌN 1:1-6
I. JỌN 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu, (emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n'ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè); ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ: ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n'akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi. Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya. Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu
I. JỌN 1:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ. Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke. Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.