I. JỌN 1:1-3
I. JỌN 1:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu, (emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n'ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè); ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ
I. JỌN 1:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.