I. NDI KỌRINT 7:4-6
I. NDI KỌRINT 7:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya. Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka. Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
I. NDI KỌRINT 7:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya. Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu. Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.