I. NDI KỌRINT 7:1-5
I. NDI KỌRINT 7:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.” Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya. Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya. Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
I. NDI KỌRINT 7:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Ma okwu bayere ihe unu dere akwukwọ bayere ha: Ọ di nma ka nwoke ghara imetu nwanyi aka. Ma, n'ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya. Ka di kwughachi nwunye-ya ugwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwughachi kwa di-ya ugwọ o ji ya. Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya. Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.