I. NDI KỌRINT 6:12-14
I. NDI KỌRINT 6:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.
I. NDI KỌRINT 6:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem. Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi: ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.