I. NDI KỌRINT 5:6-8
I. NDI KỌRINT 5:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo? Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị. Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.
I. NDI KỌRINT 5:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum? Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist: ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.