I. NDI KỌRINT 4:8-17
I. NDI KỌRINT 4:8-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze. Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m. Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.
I. NDI KỌRINT 4:8-17 Bible Nso (IGBOB)
Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze. N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu. Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere. We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi; ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide: mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n'uwa, ihe ehichapuru n'ihe nile, rue ub͕u a. Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya. N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu. Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim. N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.