I. NDI KỌRINT 3:1-4
I. NDI KỌRINT 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist. Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi; n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu? N'ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu?
I. NDI KỌRINT 3:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst. Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa. Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?