I. NDI KỌRINT 15:54-58
I. NDI KỌRINT 15:54-58 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri. Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di? Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu: ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.
I. NDI KỌRINT 15:54-58 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.” “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.