I. NDI KỌRINT 15:42-44
I. NDI KỌRINT 15:42-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike. A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
I. NDI KỌRINT 15:42-44 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré: anāgha ya n'ihe-ihere; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ebube: anāgha ya n'adighi-ike; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ike: anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n'ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.