I. NDI KỌRINT 14:18-40
I. NDI KỌRINT 14:18-40 Bible Nso (IGBOB)
Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile: otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m'ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m'were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n'asusu di iche. Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè. Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru. Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe. Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma? Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n'anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé; ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu. Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo. Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n'usoro; ka otù onye sughari kwa: ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n'etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu. Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa. Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n'akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya. N'ihi na unu nile puru ibu amuma n'otù n'otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi; anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n'okpuru ndi-amuma; n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ. Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa. Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist. Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n'ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu? Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu. Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama. Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu. Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.
I. NDI KỌRINT 14:18-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu niile. Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta. Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a. E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.” Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe. Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a? Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie. Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.” Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu. A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya. Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru. Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya. Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume. Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma. Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ. Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị. Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha! Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, maọbụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, naanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nʼonwe ya nyere m. Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ịnabata ihe ndị a, unu aṅala ya ntị. Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, unu egbochikwala onyinye nke ịsụ nʼire dị iche iche. Ma meenụ ihe niile nʼụzọ dị mma, ka ha dịkwa nʼusoro.