I. NDI KỌRINT 13:1-3
I. NDI KỌRINT 13:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n'anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà. Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula. Asi kwa na ewerem ihe nile m'nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n'anya, ọ baghm urù ọ bula.
I. NDI KỌRINT 13:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla. A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.