I. NDI KỌRINT 12:26-27
I. NDI KỌRINT 12:26-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ. Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.
Kesaa
Gụọ I. NDI KỌRINT 12I. NDI KỌRINT 12:26-27 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu. Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.
Kesaa
Gụọ I. NDI KỌRINT 12