I. NDI KỌRINT 12:14-18
I. NDI KỌRINT 12:14-18 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe. Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. Ọ buru kwa na nti gāsi, N'ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di? Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.
I. NDI KỌRINT 12:14-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ. Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ. Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ. Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla? Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ.