Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 12:12-26

I. NDI KỌRINT 12:12-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa. Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ. Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ. Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ. Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ. Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla? Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ. A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị? Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ. Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.” Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa. E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha. Ma anyị adịghị esi otu a elekọta akụkụ ahụ ndị ahụ anya na-ahụ nʼụzọ pụrụ iche, nʼihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịrị nta bụrụ nke anyị kwesiri inye nsọpụrụ karịa. Nʼụzọ dị otu a, nkewa ọbụla adịghị nʼahụ mmadụ. Akụkụ ọbụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha. Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ.

I. NDI KỌRINT 12:12-26 Bible Nso (IGBOB)

N'ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n'aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa. N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ. N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe. Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. Ọ buru kwa na nti gāsi, N'ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di? Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ. Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di? Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru. Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm. Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku: akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n'anya bu nke mabigara ókè kari; ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari; ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu. Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.