I. NDI KỌRINT 11:23-29
I. NDI KỌRINT 11:23-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.” Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ. Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
I. NDI KỌRINT 11:23-29 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam. Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam. N'ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia. Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya. Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu. N'ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.