I. NDI KỌRINT 1:4-9
I. NDI KỌRINT 1:4-9 Bible Nso (IGBOB)
Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus; na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile; dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu: nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.
I. NDI KỌRINT 1:4-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.