Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 1:18-30

I. NDI KỌRINT 1:18-30 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì, M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta. Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu? N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere. Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe: ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu; ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke. N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike. N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ: Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike; ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè: ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke. Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa

I. NDI KỌRINT 1:18-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke. E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.” Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere. Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ. Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ. Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.