I. IHE EMERE 3:1-4
I. IHE EMERE 3:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel. Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ. Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii.
I. IHE EMERE 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel; nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit; nke-ise, Shefataia nwa Abital; nke-isi, Itream nwa Egla, bú nwunye-ya. Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n'ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem.