I. IHE EMERE 29:11-12
I. IHE EMERE 29:11-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gị onwe gị, ONYENWE ANYị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, ONYENWE ANYị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
Kesaa
Gụọ I. IHE EMERE 29I. IHE EMERE 29:11-12 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi. Ma àkù ma nsọpuru nēsite n'ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di; n'aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike.
Kesaa
Gụọ I. IHE EMERE 29