I. IHE EMERE 28:9-20
I. IHE EMERE 28:9-20 Bible Nso (IGBOB)
Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya. Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie: na ihe-atù ihe nile nke di n'aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile: baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova: nke ọla-edo n'ọtùtù bayere ihe ọla-edo, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula; nke ọla-ọcha bayere ihe ọla-ọcha nile n'ọtùtù, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula: n'ọtùtù kwa bayere ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna nile ha nke ọla-edo, n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile: baye-kwa-ra ihe-idọba-oriọna nile nke ọla-ọcha, ọla-ọcha n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile, dika òfùfè ihe-idọba-oriọna ọ bula: na ọla-edo n'ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n'usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile: na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula: baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ọla-edo anuchara n'ọku n'ọtùtù: baye-kwa-ra ihe-atù ub͕ọ-ala, bú cherubim, ọla-edo, ndi nāb͕asa nkù-ha, kpuchie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova. Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m'mata site n'aka-Ya n'arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a. Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.
I. IHE EMERE 28:9-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee ONYENWE ANYị ofufe, nʼihi na ONYENWE ANYị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi. Kpachapụ anya, nʼihi na ONYENWE ANYị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie. O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu ONYENWE ANYị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ. Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi. Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha. Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha. Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo. Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka ONYENWE ANYị nweta. ONYENWE ANYị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.” Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ ONYENWE ANYị gwụsịrị.