Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 26:1-11

I. IHE EMERE 26:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Site na ndị Kora: Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf. Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom: nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ, Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii na Eliehoenai bụ onye nke asaa. Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise, Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm. Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa. Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ. E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu. Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ). Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).