I. IHE EMERE 2:3-6
I. IHE EMERE 2:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihi ya, ONYENWE ANYị gburu ya. Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise. Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul. Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
I. IHE EMERE 2:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua. Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise. Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul. Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.