I. IHE EMERE 14:8-17
I. IHE EMERE 14:8-17 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha. Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim. Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi. Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim. Ha we rapu chi nile ha n'ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n'ọku. Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu. Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam. Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia. Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea. Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.
I. IHE EMERE 14:8-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha. Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim. Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” ONYENWE ANYị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.” Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim. Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ. Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ. Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza. Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; ONYENWE ANYị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.