Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 11:20-47

I. IHE EMERE 11:20-47 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya. Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ. A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo onye Betlehem, Shamot onye Haroa, Helez onye Pelon, Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza onye Anatot, Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahohi, Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa, Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya onye Piraton, Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abiel onye Arba, Azmavet onye Baharum, Eliaba onye Shaalbon, Ụmụ Hashem onye Gizon, Jonatan nwa Shagee, onye Hara, Ahiam nwa Saka, onye Hara, Elifal nwa Ụọ, Hefa onye Mekerat, Ahija onye Pelon, Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai, Juel nwanne Netan, Miba nwa Hagri, Zelek onye Amọn, Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya, Ira onye Itra, Gareb onye Itra, Ụraya onye Het, Zabad nwa Alai, Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya. Hanan nwa Maaka, Joshafat onye Mitna, Ụzia onye Ashterat, Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea, Jediael nwa Shimri, Joha nwanne ya, onye Tiza, Eliel onye Mahavi, Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam, Itma onye Moab, Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.

I. IHE EMERE 11:20-47 Bible Nso (IGBOB)

Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu. N'etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Benaia nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, nwoke toro ogologo, cubit ise; ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu dika oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu. Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya. Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem; Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait; Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot; Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa; Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa; Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton; Hurai nke miri-iyi Gaash, Abiel onye Araba; Azmavet onye Bahurim, Eliahba onye Shaalabin; nke umu Hashem onye-Gaizonait, Jonatan nwa Shagei onye-Hararait; Ahiam nwa Saka onye-Hararait, Elifal nwa Ua; Hefa onye-Mekeratait, Ahaija onye-Pelonait; Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai; Joel nwa-nne Netan, Mibha nwa Hagri; Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia; Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta; Uraia onye Het, Zabad nwa Ahlai; Adina nwa Shiza onye Reuben, onye-isi ndi Reuben, orú ndikom na iri so-kwa-ra ya; Henan nwa Meaka, na Joshafat onye-Mitnait; Uzia onye Ashterot, Shama na Jeiel, bú umu Hotam onye Aroea; Jediael nwa Shimri, na Joha nwa-nne-ya, onye-Tizait; Eliel onye-Mahavait, na Jeribai, na Joshavia, umu Elnaam, na Itma onye Moab; Eliel, na Obed, na Jaasiel onye-Mezobait.