I. IHE EMERE 11:1-3
I. IHE EMERE 11:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. ONYENWE ANYị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ” Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu ONYENWE ANYị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka ONYENWE ANYị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
I. IHE EMERE 11:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Israel nile we chikọta onwe-ha n'ebe Devid nọ rue Hebron, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu. Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel. Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di.