Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia, Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile. Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele: Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi, Ọ nēsi na window nile lebata anya, Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata. Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim, Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo; Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi; Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu, Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi; N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 2
Geere nke a ntị ABÙ NKE ABÙ 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ NKE ABÙ 2:8-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị