Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 9:1-24

NDI ROM 9:1-24 IGBOB

Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ, na enwerem oké ihe-nwuta na ihe-nb͕u nādighi-agwu n'obim. N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di: ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile; ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n'ala. N'ihi na ndi si n'Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel: ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha. Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru. N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi- n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ, asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà. Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì. Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela. N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya. Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile. Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili. Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere? Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a? Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere? Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì: ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube, bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara