Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi; ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya: Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi. N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke. N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu. Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi. Ya mere nke kariri ri nne, ebe agusiri ayi na ndi ezi omume ub͕u a nime ọbara-Ya, agāzọputa ayi n'iwe Chineke site n'aka-Ya. N'ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n'ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n'otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n'otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya; ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi na Chineke site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye ayi siworo n'aka-Ya nata ime-ka-adi-n'otù a ub͕u a. N'ihi nka, dika nmehie si n'aka otú madu ba n'uwa, dika ọnwu si n'aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n'ihi na madu nile mehiere: n'ihi na rue mb͕e iwu biara nmehie di n'uwa: ma adighi-agu nmehie mb͕e iwu nādighi. Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia. Ma dika ndahie ahu si di, ọ bughi otú a ka onyinye-amara si di kwa. N'ihi na asi na ọra madu nwuru site na ndahie nke otù onye ahu, amara Chineke, na onyinye ahu nke di nime amara nke otù Madu ahu, Jisus Kraist, babigara ókè kari ri nne rue ọra madu.
Gụọ NDI ROM 5
Geere nke a ntị NDI ROM 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 5:1-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị