Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru. N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ; n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù; n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike; n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma. Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu. Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá. Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu. Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.
Gụọ NDI ROM 12
Geere nke a ntị NDI ROM 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 12:9-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị