Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi? ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe! Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist. Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si, Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo, Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe. Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si, Ndi nāchọghm chọtaram; Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam. Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.
Gụọ NDI ROM 10
Geere nke a ntị NDI ROM 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI ROM 10:14-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo