Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu. Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n'ihi na ọ dighi ọlu-gi M'huworo nke zuworo ezù n'iru Chinekem. Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M'gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M'gābiakwasi gi ma-ọli. Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri. Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.
Gụọ NKPUGHE 3
Geere nke a ntị NKPUGHE 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NKPUGHE 3:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo