Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NKPUGHE 19:11-21

NKPUGHE 19:11-21 IGBOB

M'we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n'ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha. Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya. Eb͕okwasiwo kwa Ya uwe nke efesaworo ọbara: akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke. Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu. Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile. O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile. M'we hu otù mọ-ozi ka ọ nēguzo nime anyanwu; o we were oké olu tie nkpu, nāsi nnunu nile nke nēfe n'etiti elu-igwe, Bianu, zukọ iri oké nri-anyasi nke Chineke; ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku. M'we hu anu-ọhia ahu, na ndi-eze uwa, na usu nile nke ndi-agha-ha, ka ha zukọrọri ibu agha megide Onye ahu Nke nānọkwasi inyinya ahu, megide kwa usu-ndi-agha-Ya. Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre: ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.