Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NKPUGHE 15

15
1M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.
2M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke. 3Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile. 4Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.
5Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, emeghe-kwa-ra ulo nsọ nke ulo-ikwū nke àmà ahu n'elu-igwe: 6ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ihe-otiti asa ahu we si n'ulo nsọ ahu puta, eb͕okwasiworo ha linen, nke di ọcha nēnwu kwa enwu, ekewo kwa ha ihe-ọkiké ọla-edo n'obi gburugburu. 7Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi. 8Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NKPUGHE 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye