M'we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m'chigharisiri m'we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me; n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu. Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku; ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n'oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri. O nwe-kwa-ra kpakpando asa n'aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n'ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n'ike-ya.
Gụọ NKPUGHE 1
Geere nke a ntị NKPUGHE 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NKPUGHE 1:12-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị