Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 91:1-16

ABÙ ỌMA 91:1-16 IGBOB

Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali. M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi. N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì. Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba: Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu. I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie; Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie. Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso. Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide, We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu. N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi; Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi. N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi, Idebe gi n'uzọ-gi nile. N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume. Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri. N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa: M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham. Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya. Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya, M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara