Merem amara, Jehova; Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì, Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu; Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile: N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion, Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi. Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere: N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha. Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye, Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi. Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike: Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi. Jehova, doro ha ihe-egwu: Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah
Gụọ ABÙ ỌMA 9
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 9:13-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị