Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,
Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;
Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
Achọtawom Devid, bú orùm;
Ewerewom manu nsọm te ya:
Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;
Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;
Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,
Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.
Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:
Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,
Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.
Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,
Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.
Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,
Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.
Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,
Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.
M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,
Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.
Ọ buru na umu-ya arapu iwum,
Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;
Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,
Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;
M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,
Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.
Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,
M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.
M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,
Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.
Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;
M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;
Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,
Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.
Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;
Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah
Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.
I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.
I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:
I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.
I tiwawo ogige-ya nile;
I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.
Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:
Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.
I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;
I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.
Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,
I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.
I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,
I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.
I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:
I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah
Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?
Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?
Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:
Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?
Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,
Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah
Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,
Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?
Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;
Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;
Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,
Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.
Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi.
Amen, na Amen.