Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku, Jehova nke usu nile nke ndi-agha! Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n'ichọ ogige nile nke Jehova; Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù. Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo, Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ezem na Chinekem. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu: Ha gānọ nēto Gi. Selah Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi; Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi. Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche; Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya. Ha nēsi n'ike jerue ike, Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem: Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah Le ọta-ayi, Chineke, Legide kwa iru onye-Gi etere manu. N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu. N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.
Gụọ ABÙ ỌMA 84
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 84
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 84:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị