Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku. Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion. N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta; Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru. Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha; Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà. Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura. Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe? I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé; Uwa turu egwu, we di jū, Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe, Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù. Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu. Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.
Gụọ ABÙ ỌMA 76
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 76
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 76:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo