Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi? Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo. Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ. Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama, Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku N'alùghi-ulù nke osisi. Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù. Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ. Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù: Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala. Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru. Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.
Gụọ ABÙ ỌMA 74
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 74
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 74:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo