N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ, Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ. Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha; Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu. N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu. N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba. Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile. N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe. Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè. Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ: Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu. Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe, Ire-ha nējeghari kwa n'uwa. N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a, Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ. Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu? Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù. Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ; Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.
Gụọ ABÙ ỌMA 73
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 73
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 73:1-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo