Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu; Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi? Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ. Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi. Mu onwem gēji kwa une kele Gi, Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem: M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma, Gi Onye Nsọ nke Israel. Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù. Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.
Gụọ ABÙ ỌMA 71
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 71
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 71:19-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị