Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 71:1-24

ABÙ ỌMA 71:1-24 IGBOB

Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo: Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi. N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu: Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam. Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nile I nyewo iwu izọputam; N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu. Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu, N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike. N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi bu ntukwasi-obim site na nwata. N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem: Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem: Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile. Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike. Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi. Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam. N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem; Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù, Si, Chineke arapuwo ya: Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di. Chineke, anọlam ebe di anya: Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka. Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim; Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ. Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi, We tukwasi otuto n'otuto-gi nile Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi; N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha. M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia: M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi. Chineke, I zíwom ihe site na nwata; Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile. Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi. Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu; Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi? Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ. Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi. Mu onwem gēji kwa une kele Gi, Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem: M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma, Gi Onye Nsọ nke Israel. Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù. Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara