Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu. M'gēji abù to aha Chineke, M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku. Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi, Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa. Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri: Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu. N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye, Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya. Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha. N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya. Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya; Ndi nāhu aha-Ya n'anya gēbi kwa nime ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 69
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 69
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 69:29-36
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo