Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 69:1-13

ABÙ ỌMA 69:1-13 IGBOB

Zọputam, Chineke; N'ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim. Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di: Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m. Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem. Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu: Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha: Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike. Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ; Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile. Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha: Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel. N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta; Ihere ekpuchiwo irum. Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ, Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ. N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom; Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam. M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim, O we ghọrọm nání ihe-ita-uta. Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem, M'we ghọrọ ha ilu. Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem; Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara. Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ: Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.